Ndị Ikpe 21

Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda.

Judges 21:2 (UKJV) And the people came to the house of God, and abode there till even before God, and lifted up their voices, and wept sore;

1Mgbe ndị ikom Izrel niile zukọtara na Mizpa, ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo Benjamin lụọ ụmụ anyị ndị inyom.”

2Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda.

3“Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?”

4Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.