Ndị Ikpe 3

Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.

Judges 3:29 (UKJV) And they slew of Moab at that time about ten thousand men, all lusty, and all men of valour; and there escaped not a man.

27Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.

28Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee.

29Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.

30Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ.

31Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.