28Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee.
29Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.
30Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ.
31Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.