1Ndị a bụ aha mba dị iche iche Onyenwe anyị hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan.
2O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga.
3Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat.
4A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie.
5Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus.