1Ndị a bụ aha mba dị iche iche Onyenwe anyị hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan.
2O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga.
3Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat.
4A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie.