Ndị Ikpe 4

Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.

Judges 4:16 (UKJV) But Barak pursued after the chariots, and after the host, unto Harosheth of the Gentiles: and all the host of Sisera fell upon the edge of the sword; and there was not a man left.

14Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.

16Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.

17Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken.

18Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.