Ndị Ikpe 4

Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.

Judges 4:14 (UKJV) And Deborah said unto Barak, Up; for this is the day in which the LORD has delivered Sisera into yours hand: is not the LORD gone out before you? So Barak went down from mount Tabor, and ten thousand men after him.

12Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,

13Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.

14Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.

16Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.