Ndị Ikpe 4

Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.

Judges 4:13 (UKJV) And Sisera gathered together all his chariots, even nine hundred chariots of iron, and all the people that were with him, from Harosheth of the Gentiles unto the river of Kishon.

11Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.

12Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,

13Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.

14Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.