Ndị Ikpe 4

Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.

Judges 4:11 (UKJV) Now Heber the Kenite, which was of the children of Hobab the father in law of Moses, had severed himself from the Kenites, and pitched his tent unto the plain of Zaanaim, which is by Kedesh.

9Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh.

10Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee.

11Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.

12Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,

13Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.