20Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ”
21Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
22Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi.
23Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel.
24Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.