Ndị Ikpe 5

‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’

Judges 5:12 (UKJV) Awake, awake, Deborah: awake, awake, utter a song: arise, Barak, and lead your captivity captive, you son of Abinoam.

10“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ

11olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.

12‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’

13“Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.

14Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.