20Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
21Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!
22Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!
23Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’
24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.