Ndị Ikpe 5

‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’

Judges 5:30 (UKJV) Have they not succeeded? have they not divided the prey; to every man a damsel or two; to Sisera a prey of divers colours, a prey of divers colours of needlework, of divers colours of needlework on both sides, meet for the necks of them that take the spoil?

28“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’

29Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị,

30‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’

31“Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.