26O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.
27Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.
28“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
29Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị,
30‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’