Ndị Ikpe 5

O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.

Judges 5:26 (UKJV) She put her hand to the nail, and her right hand to the workmen's hammer; and with the hammer she stroke Sisera, she stroke off his head, when she had pierced and stricken through his temples.

24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.

25Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.

26O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.

27Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.

28“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.