Ndị Ikpe 6

Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya.

Judges 6:5 (UKJV) For they came up with their cattle and their tents, and they came as grasshoppers for multitude; for both they and their camels were without number: and they entered into the land to destroy it.

3Mgbe ọbụla ndị Izrel ghasịrị mkpụrụ nʼubi ha, ndị Midia, ndị Amalek na ụfọdụ ndị ọzọ si nʼọwụwa anyanwụ na-abịa buso ha agha.

4Ha na-ebichi ala ahụ, bibie ihe niile a kụrụ nʼubi nʼala ahụ niile ruo na Gaza. O nweghị ihe ọbụla dị ndụ ndị Izrel nwere, ma atụrụ, ma ehi, ma ịnyịnya ibu, ha na-ahapụ.

5Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya.

6Site nʼomume ọjọọ ndị a, e mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị dara ụbịam nke ukwuu nʼihi ọchịchị ndị Midia. Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka.

7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.