5Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya.
6Site nʼomume ọjọọ ndị a, e mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị dara ụbịam nke ukwuu nʼihi ọchịchị ndị Midia. Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka.
7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha,
8Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu.
9Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha.