Ndị Ikpe 6

Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu.

Judges 6:8 (UKJV) That the LORD sent a prophet unto the children of Israel, which said unto them, Thus says the LORD God of Israel, I brought you up from Egypt, and brought you forth out of the house of bondage;

6Site nʼomume ọjọọ ndị a, e mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị dara ụbịam nke ukwuu nʼihi ọchịchị ndị Midia. Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka.

7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha,

8Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu.

9Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha.

10Agwara m unu sị, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. Unu efela chi niile nke ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha.’ Ma unu jụrụ ige m ntị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.