Ndị Ikpe 6

Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha.

Judges 6:9 (UKJV) And I delivered you out of the hand of the Egyptians, and out of the hand of all that oppressed you, and drove them out from before you, and gave you their land;

7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha,

8Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu.

9Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha.

10Agwara m unu sị, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. Unu efela chi niile nke ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha.’ Ma unu jụrụ ige m ntị.”

11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.