Ndị Ikpe 7

Ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ibuso ha agha, duru Pura onyeozi gị gaa nso nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ,

Judges 7:10 (UKJV) But if you fear to go down, go you with Phurah your servant down to the host:

8Gidiọn zilagara ndị Izrel ndị a nʼụlọ ikwu ha ma hapụ naanị narị mmadụ atọ ndị napụtara ndị ahụ na-ala ala ngwongwo niile ha ji ebu agha, na opi ike. Ndị Midia mara ụlọ ikwu ha na ndagwurugwu, nʼebe na-adịghị anya site nʼebe Gidiọn nọ.

9Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Bilie, gaa lụso ọmụma ụlọ ikwu ahụ agha, nʼihi na ana m aga inyefe ha nʼaka gị.

10Ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ibuso ha agha, duru Pura onyeozi gị gaa nso nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ,

11ṅaa ntị, nụrụ ihe ha na-ekwu. Emesịa, ị ga-abụ onye a gbara ume ibu agha megide ọmụma ụlọ ikwu ahụ.” Ya mere, ya na Pura onyeozi ya gara nʼebe dị nso, nʼebe ndị nche ọmụma ụlọ ikwu ahụ nọ.

12Ma lee, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na ndị obodo ndị ọzọ ahụ si nʼọwụwa anyanwụ bịa jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube. Nʼezie, ịnyịnya kamel ha dị ọtụtụ, dịka aja dị nʼakụkụ oke osimiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.