Ndị Ikpe 7

Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Bilie, gaa lụso ọmụma ụlọ ikwu ahụ agha, nʼihi na ana m aga inyefe ha nʼaka gị.

Judges 7:9 (UKJV) And it came to pass the same night, that the LORD said unto him, Arise, get you down unto the host; for I have delivered it into yours hand.

7Onyenwe anyị sịrị Gidiọn, “Ọ bụ narị ndị ikom atọ ndị a raara mmiri ka m ga-eji zọpụta gị, ma rarakwa ndị Midia nye gị nʼaka. Zilaga ndị fọdụrụ ka ha laa nʼụlọ nke aka ha.”

8Gidiọn zilagara ndị Izrel ndị a nʼụlọ ikwu ha ma hapụ naanị narị mmadụ atọ ndị napụtara ndị ahụ na-ala ala ngwongwo niile ha ji ebu agha, na opi ike. Ndị Midia mara ụlọ ikwu ha na ndagwurugwu, nʼebe na-adịghị anya site nʼebe Gidiọn nọ.

9Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Bilie, gaa lụso ọmụma ụlọ ikwu ahụ agha, nʼihi na ana m aga inyefe ha nʼaka gị.

10Ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ibuso ha agha, duru Pura onyeozi gị gaa nso nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ,

11ṅaa ntị, nụrụ ihe ha na-ekwu. Emesịa, ị ga-abụ onye a gbara ume ibu agha megide ọmụma ụlọ ikwu ahụ.” Ya mere, ya na Pura onyeozi ya gara nʼebe dị nso, nʼebe ndị nche ọmụma ụlọ ikwu ahụ nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.