Ndị Ikpe 7

Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”

Judges 7:15 (UKJV) And it was so, when Gideon heard the telling of the dream, and the interpretation thereof, that he worshipped, and returned into the host of Israel, and said, Arise; for the LORD has delivered into your hand the host of Midian.

13Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.”

14Onye ibe ya zara sị, “Nke a abụghị ihe ọzọ karịa mma agha Gidiọn nwa Joash, onye Izrel na-aga ịbịakwute anyị nʼebe a. Chineke enyefeela ndị Midia na ụlọ ikwu ya niile nʼaka ya.”

15Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”

16O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya.

17Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.