Ndị Ikpe 7

Onye ọbụla nʼime ha guzoro nʼebe o kwesiri ịnọ gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ndị Midia niile malitere ịgba ọsọ, na-etikwa mkpu akwa mgbe ha na-agbalaga.

Judges 7:21 (UKJV) And they stood every man in his place round about the camp; and all the host ran, and cried, and fled.

19Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche.

20Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”

21Onye ọbụla nʼime ha guzoro nʼebe o kwesiri ịnọ gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ndị Midia niile malitere ịgba ọsọ, na-etikwa mkpu akwa mgbe ha na-agbalaga.

22Mgbe ha fụrụ narị opi ike atọ ndị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị ikom niile nọ nʼakụkụ niile nke ọmụma ụlọ ikwu ahụ tụgharịa were mma agha gburịta onwe ha. Ndị agha ahụ gbapụrụ ọsọ gbara gaa Bet-Shita nʼụzọ Zerera, gbarukwaa nke oke ala Ebel-Mehola, nke dị nso Tabat.

23A kpọpụtara ndị Izrel si Naftalị, na Asha na Manase niile ka ha pụta chụso ndị Midia ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.