Ndị Ikpe 7

Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”

Judges 7:20 (UKJV) And the three companies blew the trumpets, and brake the pitchers, and held the lamps in their left hands, and the trumpets in their right hands to blow likewise: and they cried, The sword of the LORD, and of Gideon.

18Mgbe ọbụla mụ na ndị so m nʼazụ fụrụ opi ike anyị, unu niile ga-afụkwa opi ike unu nʼakụkụ ọbụla unu nọ, tie mkpu, sị, ‘Anyị dịnyere Onyenwe anyị, dịnyekwara Gidiọn.’ ”

19Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche.

20Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”

21Onye ọbụla nʼime ha guzoro nʼebe o kwesiri ịnọ gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ndị Midia niile malitere ịgba ọsọ, na-etikwa mkpu akwa mgbe ha na-agbalaga.

22Mgbe ha fụrụ narị opi ike atọ ndị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị ikom niile nọ nʼakụkụ niile nke ọmụma ụlọ ikwu ahụ tụgharịa were mma agha gburịta onwe ha. Ndị agha ahụ gbapụrụ ọsọ gbara gaa Bet-Shita nʼụzọ Zerera, gbarukwaa nke oke ala Ebel-Mehola, nke dị nso Tabat.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.