23A kpọpụtara ndị Izrel si Naftalị, na Asha na Manase niile ka ha pụta chụso ndị Midia ọsọ.
24Gidiọn ziri ozi nʼala ugwu ugwu Ifrem sị ha, “Pụtanụ gbochie ụzọ niile ndị Midia si agbafe. Cheenụ ọnụ mmiri Jọdan niile nche ruo na Bet-Bara.” Ya mere, a kpọpụtara ndị ikom niile nọ na Ifrem, bụ ndị gbochiri mmiri Jọdan ruo na Bet-Bara.
25Ha jidekwara ọchịagha ndị Midia abụọ, ndị aha ha bụ Oreb na Zeeb. Ha gburu Oreb nʼelu nkume nke na-aza aha ya ruo taa. E gbukwara Zeeb nʼebe a na-azọcha vaịnị. Ebe ahụ na-azakwa aha Zeeb ruo taa. Ha bipụrụ Oreb na Zeeb isi buru ha jekwuru Gidiọn nʼakụkụ osimiri Jọdan.