Ndị Ikpe 8

Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu.

Judges 8:1 (UKJV) And the men of Ephraim said unto him, Why have you served us thus, that you called us not, when you went to fight with the Midianites? And they did chide with him sharply.

1Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu.

2Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza?

3Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.