Ndị Ikpe 7

Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’ ” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.

Judges 7:3 (UKJV) Now therefore go to, proclaim in the ears of the people, saying, Whosoever is fearful and afraid, let him return and depart early from mount Gilead. And there returned of the people twenty and two thousand; and there remained ten thousand.

1Jerub-Baal, onye bụkwa Gidiọn, na ndị agha ya niile biliri nʼisi ụtụtụ, maa ụlọ ikwu ha nʼisi iyi Harod. Ma ndị agha Midia mara ụlọ ikwu nke ha nʼakụkụ ugwu ebe ndị Izrel nọ, nʼime ndagwurugwu nke dị nso nʼugwu nta More.

2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Lee, ndị ikom gị dị ọtụtụ. Agaghị m enyefe ndị Midia nʼaka ha, ma ọ bụghị otu a, Izrel ga-anya isi megide m, sị, ‘Ike aka m azọpụtala m.’

3Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’ ” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.

4Ma Onyenwe anyị gwara Gidiọn, sị ya, “Lee, ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Duru ha gbada na mmiri ala, m ga-anwale ha ma webilatara gị ọnụọgụgụ ha nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a ga-eso gị jee,’ ọ ga-eje, ma ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a agaghị eso gị jee,’ ọ gaghị eso jee.”

5Ya mere, Gidiọn duuru ha bịa na mmiri ala ahụ. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya okwu sị ya, “Kewapụ ndị ji ire ha rachara mmiri dịka nkịta, site na ndị ahụ gburu ikpere nʼala ịṅụ mmiri.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.