1Jerub-Baal, onye bụkwa Gidiọn, na ndị agha ya niile biliri nʼisi ụtụtụ, maa ụlọ ikwu ha nʼisi iyi Harod. Ma ndị agha Midia mara ụlọ ikwu nke ha nʼakụkụ ugwu ebe ndị Izrel nọ, nʼime ndagwurugwu nke dị nso nʼugwu nta More.
2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Lee, ndị ikom gị dị ọtụtụ. Agaghị m enyefe ndị Midia nʼaka ha, ma ọ bụghị otu a, Izrel ga-anya isi megide m, sị, ‘Ike aka m azọpụtala m.’
3Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’ ” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.