Ndị Ikpe 6

Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ.

Judges 6:40 (UKJV) And God did so that night: for it was dry upon the fleece only, and there was dew on all the ground.

38Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi.

39Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.”

40Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.