33Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.
34Ma ụmụ Izrel echetaghị Onyenwe anyị Chineke ha, onye napụtara ha site nʼaka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu.
35Ha ekwesighịkwa ntụkwasị obi nye ezinaụlọ Jerub-Baal (ya bụ Gidiọn) dịka ezi ihe niile o mere ha si dị.