1Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha,
2“Jekwurunụ ndị Shekem jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa Jerub-Baal mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.”
3Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.”