25Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme.
26Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ.
27Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek.
28Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?
29A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’ ”