Ndị Ikpe 9

Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.

Judges 9:32 (UKJV) Now therefore up by night, you and the people that is with you, and lie in wait in the field:

30Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe.

31O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị.

32Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.

33Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.”

34Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.