Ndị Ikpe 9

Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ.

Judges 9:34 (UKJV) And Abimelech rose up, and all the people that were with him, by night, and they laid wait against Shechem in four companies.

32Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.

33Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.”

34Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ.

35Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta.

36Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.