39Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ.
40Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ.
41Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem.
42Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a.
43Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.