Ndị Ikpe 9

Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a.

Judges 9:42 (UKJV) And it came to pass on the next day, that the people went out into the field; and they told Abimelech.

40Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ.

41Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem.

42Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a.

43Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.

44Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.