Ndị Ikpe 9

otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.

Judges 9:53 (UKJV) And a certain woman cast a piece of a millstone upon Abimelech's head, and all to brake his skull.

51Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ.

52Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ,

53otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.

54Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’ ” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara.

55Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.