Ndị Ikpe 9

Otu a ka Chineke si kwụghachi Abimelek ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa.

Judges 9:56 (UKJV) Thus God rendered the wickedness of Abimelech, which he did unto his father, in slaying his seventy brethren:

54Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’ ” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara.

55Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha.

56Otu a ka Chineke si kwụghachi Abimelek ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa.

57Chineke mekwara ka ndị Shekem nata ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha. Ọbụbụ ọnụ Jotam nwa Jerub-Baal mezukwara nʼisi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.