5Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; ndị iro ya nọ nʼahụ udo. Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.
6Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.
7Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala, Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie. Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị. Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya, o nweghị onye inyeaka ha hụrụ. Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ ya, chịa ya ọchị.
8Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.
9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.”