Abụ Akwa 1

Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.

Lamentations 1:8 (UKJV) Jerusalem has grievously sinned; therefore she is removed: all that honoured her despise her, because they have seen her nakedness: yea, she sighs, and turns backward.

6Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.

7Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala, Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie. Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị. Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya, o nweghị onye inyeaka ha hụrụ. Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ ya, chịa ya ọchị.

8Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.

9Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.”

10Onye iro agbasaala aka ya chịkọtaa akụ ya niile. O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche si bata ebe nsọ ya. Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.