10Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ nʼala, dere duu. Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke ehulatala isi ha nʼala.
11Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo.
12Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, “Olee ebe ọka na mmanya dị?” Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ nʼokporoụzọ obodo, mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha nʼaka nne ha ku ha.
13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, gị ada Jerusalem? Gịnị ka m ga-asị na i yiri, nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. Onye pụrụ ịgwọ gị?
14Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. Ha ekpugheghị mmehie gị, igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. Kama ihe ha hụtaara gị bụ ihe ụgha na nduhie.