13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, gị ada Jerusalem? Gịnị ka m ga-asị na i yiri, nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. Onye pụrụ ịgwọ gị?
14Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. Ha ekpugheghị mmehie gị, igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. Kama ihe ha hụtaara gị bụ ihe ụgha na nduhie.
15Ndị niile si nʼebe ị nọ na-agafe na-akụrụ gị aka ha; ha na-efufe isi ha, jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ a na-akpọ ebe mabigara mma oke, ọṅụ nke ụwa niile?”
16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha megide gị; ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. Anyị adịrịla ndụ hụ ya.”
17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.