21Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
22Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
25Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.