25Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
28Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
29Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.