24Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
25Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
28Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.