Abụ Akwa 3

Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ

Lamentations 3:34 (UKJV) To crush under his feet all the prisoners of the earth.

32Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.

33Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.

34Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ

35ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,

36ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.