30Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
31Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
32Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
34Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ