39Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
40Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
41Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42“Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
43“I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.