41Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42“Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
43“I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
44I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
45I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.