47Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
48Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
49Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
50tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
51Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.